8. Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u.
9. Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham.
10. Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì.
11. Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.
12. N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi.
13. Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.