Matiu 24:46-51 Bible Nso (IGBOB)

46. Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

47. N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

48. Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya;

49. ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa;

50. onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi,

51. ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n'etiti ndi-iru-abua: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

Matiu 24