30. mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n'elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n'obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe n'ike na oké ebube.
31. Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.
32. Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;
33. otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia nile, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzọ.
34. N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.
35. Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.
36. Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amataghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.
37. Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.
38. N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya,