1. Jisus we si n'ulo uku Chineke pua, we nāga n'uzọ-Ya; ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya igosi Ya owuwu-ulo nile nke ulo uku Chineke.
2. Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n'ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
3. Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?