29. Ma Jisus zara, si ha, Unu nēhie uzọ, ebe unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke.
30. N'ihi na nime nbilite-n'ọnwu ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di, kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe.
31. Ma n'okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ùnu agughi okwu Chineke gwara unu, si,
32. Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Chineke abughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu.
33. Ma mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ibobo ozizí-Ya nwuru ha n'aru.
34. Ma ndi-Farisi, mb͕e ha nuru na O mereri ka ndi-Sadusi kpuchie ọnu-ha, ha zukọrọ n'otù ebe.
35. Otù onye n'etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya,
36. si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi?
37. Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya.
38. Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu.
39. Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
40. Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.
41. Ma mb͕e ndi-Farisi zukọsiri, Jisus juru ha,
42. si, Gini bu uche-unu bayere Kraist ahu? Nwà onye ka Ọ bu? Ha si Ya, Nwa Devid.
43. Ọ si ha, Dèvid si kwa aṅa kpọ Ya Onye-nwe-ya nime Mọ Nsọ, si,
44. Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,Nọdu ala n'aka-nrim,Rue mb͕e M'gētiye ndi-iro-Gi n'okpuru ukwu-Gi abua?
45. Ya mere, ọ buru na Devid akpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si aṅa buru Nwa-ya?
46. Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n'ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.