18. Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua?
19. Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling.
20. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya?
21. Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.
22. Mb͕e ha nuru ya, o we ju ha anya, ha we rapu Ya, je nke ha.
23. N'ubọchi ahu ndi-Sadusi biakutere Ya nāsi na nbilite-n'ọnwu adigh: ha we jua Ya,