Matiu 21:32-36 Bible Nso (IGBOB)

32. N'ihi na Jọn biakutere unu n'uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya.

33. Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.

34. Ma mb͕e oge nkpuru ruru nso, o zigara ndi-orù-ya jekuru ndi-ọlu-ubi ahu, inata nkpuru-ya.

35. Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume.

36. Ọzọ, o zigara ndi-orù ọzọ di ọtutu kari ndi mbu: ha we me kwa ha otú ahu.

Matiu 21