Matiu 21:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu ihe ọ bula, unu gāsi, Ha di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa ọ gēzite ha.

4. Ma emewo nka, ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si,

5. Sinu ada Zaion,Le, Eze-gi nābiakute gi,Ọ di nwayọ, Ọ nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu,Na n'elu nwa-inyinya-ibu, bú nwa anu nēbu ibu.

6. Ndi ahu ndi nēso uzọ-Ya we ga, me dika Jisus nyere ha iwu,

7. ha we sekputa inyinya-ibu ahu, na nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ha uwe-ha; O we nọkwasi ha.

8. Ndi kariri n'ìgwè madu ahu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ b͕ubitara alaka n'osisi, tusa kwa ha n'uzọ.

Matiu 21