1. O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, O si na Galili zọlie, bia n'ókè-ala Judia n'ofè Jọdan;
2. oké ìgwè madu we so Ya; O we me ka aru-ha di ike n'ebe ahu.
3. Ndi-Farisi we biakute Ya, nānwa Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya n'ihi ihe nile ọ bula?
4. O we za, si, Ùnu agughi na Onye kère ha site na nmalite mere ha nwoke na nwayi,
5. we si, N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru?