Matiu 18:18-30 Bible Nso (IGBOB)

18. N'ezie asim unu, Ka ha ra, bú ihe unu gēke ab͕u n'elu uwa, agēke ha n'elu-igwe: ka ha ra kwa, bú ihe unu gātọpu n'elu uwa, agātọpu ha n'elu-igwe.

19. Ọzọ, asim unu, na ọ buru na madu abua n'etiti unu gēnwe otù olu n'elu uwa bayere ihe ọ bula ha gāriọ, agēme ya nye ha site na Nnam Nke bi n'elu-igwe.

20. N'ihi na ebe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n'aham, n'ebe ahu ka M'nọ n'etiti ha.

21. Mb͕e ahu Pita biakutere Ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, ùb͕ò ole ka nwa-nnam gēmehie megidem, ewem b͕aghara ya? rùe ub͕ò asa?

22. Jisus si ya, Asighm i, Rue ub͕ò asa; kama, Rue ọgu ub͕ò atọ na iri uzọ asa.

23. N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie.

24. Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise.

25. Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.

26. Ya mere orù ahu dara n'ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi ihe nile.

27. Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n'aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri.

28. Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji.

29. Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi.

30. Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji.

Matiu 18