Matiu 17:22-27 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma mb͕e ha bi na Galili, Jisus siri ha, Agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu;

23. ha gēb͕u kwa Ya, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. O we wuta ha ri nne.

24. Ma mb͕e ha biara na Kapanaum, ndi nānara ego ùtú biakutere Pita, si, Ònye-ozizí-unu adighi-atu ego ùtú?

25. Ọ si, E. Mb͕e ọ batara n'ulo, Jisus we buru uzọ gwa ya okwu, si, Gini bu uche-gi, Saimon? ndi-eze uwa, sìte n'aka ole ndi ka ha nānara ùtú-ahia ma-ọbu ùtú n'isi madu? n'àka umu-ha, ma-ọbu n'aka ndi-ọbìa?

26. Ma mb͕e ọ siri, N'aka ndi-ọbìa, Jisus si ya, Ya mere umu-ha puru nime ya.

27. Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.

Matiu 17