1. Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne-ya, tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche:
2. O we nwogha n'iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè.
3. Ma le, eme ka ha hu Moses na Elaija ka ha na Ya nēkwurita okwu.
4. Pita we za, si Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ọ buru na I nāchọ, m'gāma ulo-ikwū atọ n'ebe a; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.
5. Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.
6. Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ha we da kpuchie iru-ha n'ala, tu kwa egwu ri nne.
7. Jisus we biakute ha, metu ha aka, si, Bilienu, unu atu-kwa-la egwu.
8. Ma mb͕e ha weliri anya-ha elu, ha ahughi onye ọ bula, ma-ọbughi nání Jisus.
9. Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie.
10. Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Gini mere ndi-ode-akwukwọ ji si kwa na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?
11. O we za, si, Ọ bu ezie na Elaija nābia, Ọ gēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu:
12. ma asim unu, na Elaija abiawori ub͕u a, ha amazughi kwa ya, kama ha mere n'aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbuná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hu ahuhu.
13. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu bayere Jọn Baptist.
14. Mb͕e ha biakutere ìgwè madu ahu, otù nwoke we biakute Ya, nēb͕uru Ya ikperè, nāsi kwa,
15. Onye-nwe-ayi, mere nwam nwoke ebere: n'ihi na ọ bu onye ọnwa nēme ka anya ghara idi ya nma, ọ nāhu kwa ahuhu nke-uku: n'ihi na ọtutu mb͕e ọ nādabà n'ọku, ọtutu mb͕e ọ nādabà kwa na miri.