Matiu 14:4-8 Bible Nso (IGBOB)

4. N'ihi na Jọn nāsi ya, O zighi gi ezi n'iwu inwe ya dika nwunye.

5. Ọ bu ezie na ọ chọrọ ib͕u kwa ya, ma ọ turu egwu ọra ndi-Ju, n'ihi na ha guru ya n'onye-amuma.

6. Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n'etiti, o we tọ Herod utọ.

7. N'ihi ya o were iṅu-iyi kwe nkwa inye ya ihe ọ bula ọ gāriọ.

8. Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a.

Matiu 14