7. Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.
8. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.
9. Onye nwere nti, ya nu.
10. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu?
11. O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.
12. N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.
13. N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa.
14. Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si,N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:
15. N'ihi na obi ndi nka mara abuba,Nti-ha kpọchi-kwa-ra,Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
16. Ma ngọzi nādiri anya-unu, n'ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n'ihi na ha nānu ihe.