51. Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E.
52. O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie.
53. O rue, mb͕e Jisus tubìri ilu ndia, O si n'ebe ahu zọlie.
54. O we bia n'ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n'ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike?
55. Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas?