Matiu 13:22-33 Bible Nso (IGBOB)

22. Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

23. Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

24. O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n'ubi-ya:

25. ma mb͕e madu nāraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n'etiti ọka, we la.

26. Ma mb͕e npute puru, we mia nkpuru, mb͕e ahu ata ahu puta-kwa-ra ìhè.

27. Ndi-orù nna-nwe-ulo ahu we biakute ya, si ya, Onye-nwe-ayi, i ghaghi nkpuru ọma n'ubi-gi? òle ebe kwa ka o si nwe ata?

28. Ọ si ha, Madu nke bu onye-iro mere nka. Ndi-orù-ya we si ya, Ì nāchọ kwa ka ayi je chikọputa ha?

29. Ma ọ si, É-è; ka unu we ghara iropu ha na ọka ma eleghi anya, mb͕e unu nāchikọputa ata.

30. Rapunu ha abua ka ha nābakọta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n'oge owuwe-ihe-ubi m'gāsi ndi nēwe ihe-ubi, Burunu uzọ chikọta ata ahu, ke kwa ha n'ùkwù ka unu rechapu ha ọku: ma kpokọtanu ọka ahu n'ọba nkem.

31. O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n'ubi-ya:

32. nke ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile; ma mb͕e ọ bara uba, o bùkari ihe nile anāku n'ubi, we ghọ osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nānọ n'alaka-ya.

33. Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.

Matiu 13