Matiu 12:45-50 Bible Nso (IGBOB)

45. Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya, ha we bà biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu. Otú a ka ọ gādi-kwa-ra ajọ ọb͕ọ a.

46. Mb͕e Ọ nọ nāgwa ìgwè madu nile okwu, le, nne-Ya na umu-nne-Ya guzoro n'èzí, nāchọ igwa Ya okwu.

47. Otù onye we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nēguzo n'èzí, nāchọ igwa Gi okwu.

48. Ma Ọ zara, si onye gwara Ya, Ònye bu nnem? òle ndi bu kwa umu-nnem?

49. O we setipu aka-Ya n'ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, si, Le, nnem na umu-nnem!

50. N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Matiu 12