17. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,
18. Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara;Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma:M'gātukwasi Ya Mọ nkem,Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.
19. Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike;Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá.
20. Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia,Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku,Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri.
21. Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.
22. Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ.
23. Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n'aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid?
24. Ma mb͕e ndi-Farisi nuru ya, ha si, Nwoke a adighi-achupu ndi-mọ ọjọ, ma-ọbughi n'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ahu.
25. Ma ebe Ọ matara ihe di ha n'obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo:
26. Ọ buru kwa na Setan achupu Setan, o kewara megide onwe-ya; àla-eze-ya gēsi kwa aṅa guzo?