14. Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.
15. Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike,
16. O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè:
17. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,
18. Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara;Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma:M'gātukwasi Ya Mọ nkem,Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.
19. Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike;Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá.
20. Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia,Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku,Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri.
21. Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.
22. Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ.