10. ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo.
11. ma Ọ siri ha, Òle madu gādi n'etiti unu, nke gēnwe otù aturu, ma ọ buru na aturu ahu adabà nime olùlù n'ubọchi-izu-ike, ọ̀ gaghi-ejide ya, dọgoputa ya?
12. Òle kwa ka ọ ra, bú otú ọnu-ahia madu kariri nke aturu oké ọnu! Ya mere o ziri ezi n'iwu ime ihe ọma n'ubọchi-izu-ike.
13. Mb͕e ahu Ọ si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya; ewe me ka aka-ya di nma, dika nke-ọzọ.
14. Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.
15. Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike,