12. Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.
13. N'ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn.
14. Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia.
15. Onye nwere nti inu ihe, ya nu.
16. Ma M'gēji ọb͕ọ a tuyere gini? O yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, ndi nākpọ ibe-ha òkù,