Matiu 11:10-21 Bible Nso (IGBOB)

10. Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si,Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi,Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.

11. N'ezie asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze elu-igwe ka ya uku.

12. Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.

13. N'ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn.

14. Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia.

15. Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

16. Ma M'gēji ọb͕ọ a tuyere gini? O yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, ndi nākpọ ibe-ha òkù,

17. si, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi aka n'obi.

18. N'ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ.

19. Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n'onye ezi omume site n'ọlu-ya nile.

20. Mb͕e ahu ka Ọ malitere ita obodo ahu uta, bú nke Ọ lukariri ọlu-Ya di ike nime ha, n'ihi na ha echègharighi.

21. Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga n'ákwà-nkpe na ntu.

Matiu 11