Matiu 11:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Jisus nyebìri ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya iwu, O si n'ebe ahu pua izí ihe na ikwusa n'obodo nile ha.

2. Ma mb͕e Jọn nuru n'ulo-nkpọrọ ọlu nile nke Kraist ahu, o ziga ozi site n'aka ndi nēso uzọ-ya,

3. si Ya, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye di iche?

4. Jisus we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu nānu na nke unu nāhu:

Matiu 11