Matiu 1:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia;

11. Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon.

12. Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel;

13. Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa;

14. Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud;

15. Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob;

16. Jekob we mua Josef di Meri, nwanyi nke muru Jisus, Onye anākpọ Kraist.

17. Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.

18. Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ.

Matiu 1