1. Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n'irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
2. Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n'ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà:
3. Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n'ezi omume.
4. Onyinye-inata-iru-ọma nke Juda na Jerusalem gātọ kwa Jehova utọ, dika n'ubọchi mḅe ebighi-ebi gara aga, na dika n'arọ nile gara aga.
5. M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
6. N'ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob.
7. Site n'ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n'ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi?
8. Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.
9. Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile.
10. Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.