16. N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.
17. Unu ejiwo okwu nile unu me ka ike gwu Jehova. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi meworo ka ike gwu Ya? N'isi, Onye ọ bula nke nēme ihe ọjọ di nma n'anya Jehova, ọ bu kwa ihe-ha nātọ Ya onwe-ya utọ; ma-ọbu òle ebe Chineke nke ikpé nọ?