Mak 9:9-28 Bible Nso (IGBOB)

9. Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, O we gwasie ha ike ka ha ghara ikọrọ onye ọ bula ihe ha hururi, ma-ọbughi mb͕e Nwa nke madu gēsiwori na ndi nwuru anwu bilie.

10. Ha we jide okwu ahu, nājurita onwe-ha ihe isi-na-ndi-nwuru-nawu-bilie bu.

11. Ha we jua Ya, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?

12. O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n'akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu?

13. Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n'akwukwọ nsọ.

14. Mb͕e ha biakutere ndi nēso uzọ-Ya, ha we hu oké ìgwè madu ka ha nọ ha buruburu, ha hu kwa ndi-ode-akwukwọ ka ha nāju ha ajuju.

15. Ngwa ngwa ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile si-ike n'aru, mb͕e ha huru Ya, ha we b͕akuru Ya, kele Ya.

16. O we jua ha, si, Àjuju gini ka unu nāju ha?

17. Otù nwoke we si n'ìgwè madu ahu za Ya, si, Onye-ozizi, ekutaram I nwam nwoke, nke nwere mọ nādighi-ekwu okwu;

18. ebe ọ bula o jidere ya, o we tie ya n'ala: ọ nāsu kwa ufufu n'ọnu, nāta kwa ikekere-ezé, nāta kwa aru: m'we gwa ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ba enweghi ike.

19. O we za ha, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya.

20. Ha we kuru ya biakute Ya: mb͕e ọ huru Ya, ngwa ngwa mọ ahu we sesie ya ike; o we da n'ala, nāturu, nāsu kwa ufufu.

21. O we jua nna-ya, si, Ò ruru ole mb͕e ihe a meworo ya? O we si, Site na nwata.

22. Ọtutu mb͕e ọ tubà-kwa-ra ya n'ọku na nime miri, ila ya n'iyì: ma ọ buru na I puru ime ihe, nwe ọmiko n'aru ayi, nyere ayi aka.

23. Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.

24. Ngwa ngwa nna nwatakiri ahu tiri nkpu, si, Ekwem; nyere ekweghi-ekwem aka.

25. Ma mb͕e Jisus huru na ìgwè madu nāb͕akọta, Ọ bara mọ ahu nādighi ọcha nba, si ya, Gi mọ nādighi-ekwu okwu na nke nti chiri, Mu onwem nēnye gi iwu, si nime ya puta, abà-kwa-la nime ya ọzọ.

26. Mb͕e o tisiri nkpu, sesi kwa ya ike, o we puta: nwa ahu we di ka ozu; ya mere ndi ka nime ha si, Ọ nwuruwo.

27. Ma Jisus jidere ya n'aka, palie ya elu; o we bilie.

28. Mb͕e Ọ batara n'ulo-ha, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya iche, si, Gini mere ayi onwe-ayi apughi ichupu mọ ahu?

Mak 9