43. Ọzọ ọ buru na aka-gi eme gi ka i ma n'onyà, bipu ya: o di gi nma ibà na ndu n'ọlusi, kari inwe aka-gi abua ba n'ọku ala-mọ, n'ọku anyughi-anyu;
44. ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu.
45. Ọ buru kwa na ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya: ọ di gi nma ibà na ndu na ngwurọ, kari inwe ukwu-gi abua atubà gi n'ọku ala-mọ;
46. ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu.
47. Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n'ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ;
48. ebe ikpuru nke nēri ha nādighi-anwu, ọku anyughi kwa anyu.
49. N'ihi na agēji ọku b͕a onye ọ bula nnú.
50. Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.