4. Ewe me ka ha hu Elaija na Moses: ha na Jisus nēkwurita kwa okwu.
5. Pita we za, si Jisus, Rabai, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.
6. N'ihi na ọ maghi ihe ọ gāza; n'ihi na ha nātu oké egwu.
7. Igwe-oji we bia kpuchie ha: olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya: nurunu okwu-Ya.
8. Na mberede, mb͕e ha lere anya buruburu, ha ahughi onye ọ bula ọzọ, ma-ọbughi nání Jisus, Ya na ha.
9. Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, O we gwasie ha ike ka ha ghara ikọrọ onye ọ bula ihe ha hururi, ma-ọbughi mb͕e Nwa nke madu gēsiwori na ndi nwuru anwu bilie.
10. Ha we jide okwu ahu, nājurita onwe-ha ihe isi-na-ndi-nwuru-nawu-bilie bu.
11. Ha we jua Ya, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?
12. O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n'akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu?
13. Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n'akwukwọ nsọ.
14. Mb͕e ha biakutere ndi nēso uzọ-Ya, ha we hu oké ìgwè madu ka ha nọ ha buruburu, ha hu kwa ndi-ode-akwukwọ ka ha nāju ha ajuju.