Mak 9:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Ha we kuru ya biakute Ya: mb͕e ọ huru Ya, ngwa ngwa mọ ahu we sesie ya ike; o we da n'ala, nāturu, nāsu kwa ufufu.

21. O we jua nna-ya, si, Ò ruru ole mb͕e ihe a meworo ya? O we si, Site na nwata.

22. Ọtutu mb͕e ọ tubà-kwa-ra ya n'ọku na nime miri, ila ya n'iyì: ma ọ buru na I puru ime ihe, nwe ọmiko n'aru ayi, nyere ayi aka.

23. Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.

24. Ngwa ngwa nna nwatakiri ahu tiri nkpu, si, Ekwem; nyere ekweghi-ekwem aka.

25. Ma mb͕e Jisus huru na ìgwè madu nāb͕akọta, Ọ bara mọ ahu nādighi ọcha nba, si ya, Gi mọ nādighi-ekwu okwu na nke nti chiri, Mu onwem nēnye gi iwu, si nime ya puta, abà-kwa-la nime ya ọzọ.

26. Mb͕e o tisiri nkpu, sesi kwa ya ike, o we puta: nwa ahu we di ka ozu; ya mere ndi ka nime ha si, Ọ nwuruwo.

Mak 9