Mak 7:26-37 Bible Nso (IGBOB)

26. Ma nwanyi ahu bu onye-Grik, buru onye Sairo-Finisia n'ọmumu-ya. O we kpere Ya ka Ọ chupu mọ ọjọ ahu n'aru nwa-ya nwanyi.

27. O we si ya, Kwe ka afọ buru uzọ ju umu: n'ihi na ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.

28. Ma ọ zara, si Ya, E, Onye-nwe-ayi: ọbuná umu-nkita n'okpuru table nēri irighiri ufọdu na nri umu ntà.

29. O we si ya, N'ihi okwu a laba; mo ọjọ ahu apuwo n'aru nwa-gi nwanyi.

30. O we la n'ulo-ya, hu nwatakiri-ya na atọb͕ọrọ ya n'elu ihe-ndina-ya, hu kwa na mọ ọjo ahu apuwori.

31. O si-kwa-ra n'ókè-ala Taia pua ọzọ, we gabiga n'etiti Saidon, si n'etiti ókè-ala Dekapọlis, rue oké osimiri Galili.

32. Ha we kutara Ya otù onye nti chiri, nke nāsu kwa nsu; ha we riọ Ya ka O bikwasi ya aka-Ya.

33. O we si n'igwè madu ahu kupu ya iche, we tiye nkpisi-aka-Ya na nti-ya abua, bu kwa ọnu-miri, metu ire-ya;

34. O we le anya n'elu-igwe, sua udè, si ya, Efata, nke isi-ya bu, Ghere oghe.

35. Nti-ya abua we ghere oghe, ekike ire-ya tọpu kwa, o we kwuzi okwu.

36. O we gwasie ha ike ka ha ghara igwa onye ọ bula: ma ka ọ ra, bú otú Ya onwe-ya gwasiri ha ike, otú a ka ha nēkwusa kari ya nke-uku.

37. Ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, ha si, O mewo ihe nile nke-ọma: Ọ nēme ọbuná ndi nti chiri ka ha nu ihe, me kwa ndi nāpughi ikwu okwu ka ha kwue.

Mak 7