1. Ha we zukọ n'ebe Ọ nọ, bú ndi-Farisi, na ufọdu nime ndi-ode-akwukwọ, ndi siri na Jerusalem bia,
2. ndi hu-kwa-ra na ufọdu nime ndi nēso uzo-Ya nēri nri-ha n'aka ruru árú, nke ahu bu, aka anākwọghi akwọ.
3. N'ihi na ndi-Farisi, na ndi-Ju nile, ọ buru na ha akwọchaghi aka-ha, ha adighi-eri ihe, n'ihi na ha nējide ozizí nke ndi-okenye nyere ha n'aka idebe: