14. Herod, bú eze, we nu, n'ihi na aha-Ya putara ìhè: o we si, Jọn onye nēme baptism, emewo ka o si na ndi nwuru anwu bilie, n'ihi nke à ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.
15. Ma ndi ọzọ si, Ọ bu Elaija. Ndi ọzọ si kwa, Ọ bu onye-amuma, dika otù nime ndi-amuma.
16. Ma mb͕e Herod nuru ya, ọ si, Jọn, onye mu onwem bipuru isi-ya, emere onye ahu ka o si n'ọnwu bilie.
17. N'ihi na Herod onwe-ya zipururi jide Jọn, we ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya: n'ihi na ọ luru ya na nwunye.
18. N'ihi na Jọn nāsi Herod, O zighi gi ezi n'iwu inwe nwunye nwa-nna-gi.
19. Ma Herodias dobere ya iwe n'obi, ọ chọ-kwa-ra ib͕u ya; ma ọ pughi;
20. n'ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya.