Mak 5:33-43 Bible Nso (IGBOB)

33. Ma nwanyi ahu, ebe ọ matara ihe emere ya-ri, ọ tua egwu, ma kwa jijiji, bia da n'iru Ya, gwa Ya ezi-okwu nile.

34. Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.

35. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, ha si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa?

36. Ma Jisus aṅaghi nti n'okwu anēkwu, Ọ si onye-isi ulo-nzukọ ahu, Atula egwu, kwere nání.

37. O kweghi kwa onye ọ bula so Ya je, ma-ọbughi Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne Jemes.

38. Ha we bia ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu; O we hu ùzù, na ọtutu madu ka ha nākwa ákwá nēti kwa nkpu nke-uku.

39. Mb͕e Ọ batasiri, O we si ha, Gini mere unu nātu ùzù, nākwa kwa ákwá? nwatakiri ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura.

40. Ha we chìa Ya ọchì. Ma mb͕e Ọ chupusiri ha nile, Ọ kuru nna nwatakiri ahu na nne-ya na ndi Ya na ha yikọ, we ba n'ebe nwatakiri ahu di.

41. O we jide nwatakiri ahu n'aka, si ya, Talita kumi; nke bu, ma asugharia ya, Nwa-ab͕ọghọ ntà, asim i, Bilie.

42. Ngwa ngwa nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie, jeghari kwa; n'ihi na ọ b͕ara arọ iri na abua. Ngwa ngwa ibobo we nwubiga ha nile ókè n'aru

43. O we gwasie ha ike ka onye ọ bula ghara imara nka: O we si ka enye ya ihe-oriri.

Mak 5