Mak 5:25-30 Bible Nso (IGBOB)

25. Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua,

26. nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ,

27. ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n'azu Ya n'etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka.

28. N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.

29. Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu.

30. Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n'ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka?

Mak 5