Mak 4:10-15 Bible Nso (IGBOB)

10. Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu.

11. O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n'èzí ihe nile n'ilu:

12. ka ha we hu n'ọhuhu, ghara ihuta; ka ha we nu kwa n'ọnunu, ghara inuta; ka ha ghara ichighari mb͕e ọ bula, ewe gb͕aghara ha.

13. O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile?

14. Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke.

15. Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha.

Mak 4