Mak 2:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Ọ batara ọzọ na Kapanaum mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, ewe nu na Ọ nọ nime ulo.

2. Otutu madu we zukọ, nke mere na uzọ adighi ọzọ, é-è, ọbuná n'ọnu-uzọ: Ọ nāgwa kwa ha okwu Chineke.

3. Ha we bia, kutara Ya otù onye akuku-aru-ya nwuru anwu, nke madu anọ nēbu.

4. Mb͕e ha apughi ikuru ya biakute Ya n'ihi ìgwè madu, ha we kpupu elu ulo ebe Ọ nọ: mb͕e ha gwupusiri ya, ha we buda ute nke onye akuku-aru-ya nwuru anwu nēdina.

5. Mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.

6. Ma ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ nānọdu ala n'ebe ahu, nātule kwa okwu n'obi-ha,

7. si, Gini mere Nwoke a nēkwu okwu otú a? Ọ nēkwulu Chineke: ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke?

8. Ngwa ngwa ebe Jisus mazuru nime mọ-Ya na ha nātule okwu nime onwe-ha otú a, Ọ si ha, Gini mere unu nātule ihe ndia n'obi-unu?

9. Òle nke ka nfe, isi onye akuku-aru-ya nwuru anwu, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, chiri ute-gi, jeghari kwa?

10. Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie, (Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu),

Mak 2