Mak 15:16-32 Bible Nso (IGBOB)

16. Ndi-agha we dupu Ya ga ba n'obí, nke bu Pritoriọm; ha we kpọkọ òtù- ha dum.

17. Ha we yikwasi Ya uwe ododo; mb͕e ha kpasiri okpu-nmeri nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi;

18. ha we malite ikele Ya, si, Ekele, Eze ndi-Ju!

19. Ha were kwa amì nēti Ya n'isi, ha nābusa kwa Ya ọnu-miri, ha we b͕ue ikperè nākpọ isi ala nye Ya.

20. Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ododo ahu, we yikwasi Ya uwe-Ya nile. Ha we dupu Ya ka ha kpọgide Ya n'obe.

21. Ha we jide otù onye nke nāgabiga ka o so ha, ka o we būru obe-Ya, bú Saimon onye Sairini, nna Aleksanda na Rufọs, nke si n'azu obodo ahu bia.

22. Ha we kuru Ya bia n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, ma asugharia ya, Ebe okpokoro-isi.

23. Ha we che n'iru Ya manya-vine nke agwara myrrh: ma Ọ naraghi ya.

24. Ha we kpọgide Ya n'obe, kè kwa uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà n'elu ha, nke onye ọ bula gēwe.

25. Ma ọ bu oge hour nke-atọ, ha we kpọgide Ya n'obe.

26. Edekwasi-kwa-ra ndekwasi nke ihe eboro Ya, EZE NDI-JU.

27. Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya.

28. Ewe mezue ihe edere n'akwukwọ nsọ, nke si, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya.

29. Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ,

30. zọputa Onwe-gi, si n'elu obe ridata.

31. Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ nēme Ya ihe-ọchì n'etiti onwe-ha, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya.

32. Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.

Mak 15