Mak 14:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma Ọ siri ha, Ọ bu otù onye nime unu iri na abua, onye nke Mu na ya nēsukọ nri n'afere.

21. N'ihi na Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ banyere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.

22. Mb͕e ha nēri ihe, O we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, nye ha, si, Naranu: nka bu arum.

23. O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya.

24. O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu.

25. N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke.

26. Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.

Mak 14