Mak 14:17-19 Bible Nso (IGBOB)

17. Mb͕e o ruru anyasi Ya na ndi-ozi iri na abua ahu we bia.

18. Mb͕e ha nānọdu na nri nēri kwa ihe, Jisus we si, N'ezie asim unu, Otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye, bú onye Mu na ya nēri ihe.

19. Ọ malitere iwuta ha, ha malite-kwa-ra isi Ya n'otù, Ọ̀ bu mu?

Mak 14