29. otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzo.
30. N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.
31. Elu-igwe na uwa gagabiga: ma okuwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.
32. Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amat'aghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.