Mak 11:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu, Gini mere unu nēme nka? sinu, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa Ọ gēzighachi ya n'ebe a ọzọ.

4. Ha we je, hu nwa-inyinya-ibu elibere n'ọnu-uzọ n'èzí n'amá; ha we tọpu ya.

5. Ufọdu nime ndi guzoro n'ebe ahu we si ha, Ùnu nēme gini, nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu?

6. Ha we gwa ha okwu dika Jisus kwuru: ha we rapu ha.

7. Ha we sekputara Jisus nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ya uwe-ha; O we nọkwasi ya.

8. Ọtutu madu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ akwukwọ osisi, nke ha b͕ubitara n'ubi.

9. Ndi naga n'iru, na ndi nēso, nēti nkpu, si, Hosanna; Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi:

10. Ihe agọziri agọzi ka ala-eze bu nke nābia, ala-eze nke nna-ayi Devid: Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu.

11. O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu.

12. N'echi-ya, mb͕e ha putara na Betani, agu guru Ya.

13. Mb͕e Ọ huru osisi fig n'ebe di anya nke nwere akwukwọ ndu, Ọ bia, ma ebe ọ di otú a Ọ gāhu ihe n'elu ya: ma mb͕e Ọ biaruru ya aru, Ọ hughi ihe ọ bula ma-ọbughi akwuwọ ndu: n'ihi na ọ bughi oge nkpuru fig.

14. O we za, si ya, Onye ọ bula eri-kwa-la nkpuru ọzọ si n'elu gi puta ebighi-ebi. Ndi nēso uzọ-Ya we nu ya.

15. Ha we bia rue Jerusalem: O we ba n'ulo uku Chineke, malite ichupu ndi nēre na ndi nāzu n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nteke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru;

16. O kweghi kwa ka onye ọ bula būru ihe gabiga n'etiti ulo uku Chineke.

Mak 11