4. Ha we si, Moses kwere ka ede akwukwọ nkewa, ka arapu kwa ya.
5. Ma Jisus siri ha, N'ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n'akwukwọ.
6. Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.
7. N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya;
8. ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru.
9. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.
10. N'ulo ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ajuju okwu a ọzọ.