Mak 10:2-10 Bible Nso (IGBOB)

2. Ndi-Farisi we biakute Ya, jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya? nānwa Ya.

3. O we za, si ha, Gini ka Moses nyere unu n'iwu?

4. Ha we si, Moses kwere ka ede akwukwọ nkewa, ka arapu kwa ya.

5. Ma Jisus siri ha, N'ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n'akwukwọ.

6. Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.

7. N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya;

8. ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru.

9. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.

10. N'ulo ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ajuju okwu a ọzọ.

Mak 10