4. N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.
5. N'ihi nka i gaghi-enwe onye nātu eriri-ọtùtù n'ala ruru madu n'ife-nzà nime nkpọkọta ndi Jehova.
6. Unu abusala okwu dika miri, otú a ka ha nābusa okwu. Ha agaghi-abusará ndia okwu: okwu-ha nke nētiye n'ọnọdu-ihere agaghi-ewezuga onwe-ha.
7. Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n'ezi nma?