Luk 9:37-54 Bible Nso (IGBOB)

37. O rue, n'ubọchi so ya, mb͕e ha siri n'ugwu ahu rida, na oké ìgwè madu zutere Ya.

38. Ma le, otù nwoke si n'ìgwè madu ahu ti nkpu, si, Onye-ozizí, ariọm Gi ka I le nwam nwoke anya; n'ihi na ọ bu nwam m'muru nání ya:

39. le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n'ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku.

40. M'we riọ ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ha apughi.

41. Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n'ebe a.

42. Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n'ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya.

43. Ma ibobo idi-uku nke Chineke nwuru ha nile n'aru.Ma mb͕e ihe nile Ọ nēme nēju madu nile anya, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

44. Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n'ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu.

45. Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a.

46. Iru-uka we da n'etiti ha, onye gāka ibe-ya uku n'etiti ha.

47. Ma mb͕e Jisus huru iru-uka nke di n'obi-ha, O jide nwatakiri n'aka, debe ya n'akuku Ya,

48. we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n'ihi na onye dikari ntà n'etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.

49. Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi.

50. Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu.

51. O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem,

52. O we zipu ndi-ozi n'iru Ya: ha we ga, ba n'otù obodo ntà nke ndi Sameria, ka ha doziere Ya.

53. Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n'ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem.

54. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha?

Luk 9