1. O we kpọkọta ndi-ozi iri na abua ahu, nye ha ike na ichi-isi n'ebe ndi-mọ ọjọ nile nọ, na igwọ ọria di iche iche.
2. O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.
3. O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n'ije-unu, unu ewela nkpa-n'aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua.
4. Ulo ọ bula unu gābà, nọgidenu n'ebe ahu, si kwa n'ebe ahu pua.
5. Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n'obodo ahu tichapu ájá di n'ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.
6. Ha we pua, we nējezu obodo ntà ahu nile, nēzisa ozi ọma Ya, nēme kwa ka aru madu di ike n'ebe nile.
7. Ma Herod, bú tetrarch, nuru ihe nile emere: o we nēcheb͕u onwe-ya, n'ihi na ufọdu siri, na Jọn esiwori na ndi nwuru anwu bilie;