9. Ma mb͕e Jisus nuru ihe ndia, o juru Ya anya n'ihi ya, o we chigharia, si ìgwè madu nke nēso Ya, Asim unu, ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a, ọbuná n'Israel.
10. Ndi ezitere we laghachi n'ulo-ya, hu ka aru di orù ahu nma.
11. O rue, mb͕e nwa oge gasiri, na Ọ garuru obodo anākpọ Nain; ndi nēso uzọ-Ya we so Ya ga, ha na oké ìgwè madu.
12. Ma mb͕e Ọ biaruru nso ọnu-uzọ-ama obodo ahu, le, anēbupu otù onye nwuru anwu, bú nwa-nwoke nke nne-ya muru nání ya, nwanyi ahu bu kwa onye di-ya nwuru: oké ìgwè nke ndi obodo ahu soro kwa ya.
13. Mb͕e Onye-nwe-ayi huru ya, O we nwe ọmiko n'aru ya, si ya, Akwala ákwá.
14. O we biaru nso, metu ib͕e ozu ahu aka: ndi nēbu ya we guzo. O we si, Nwa-okorọbia, gi ka M'nāsi, Bilie.
15. Onye ahu nke nwuru anwu we nọlie, malite ikwu okwu. O we were ya nye nne-ya.
16. Madu nile we tua egwu: ha we nye Chineke otuto, si, Onye-amuma uku ebiliwo n'etiti ayi: ha si kwa, Chineke eletawo ndi-Ya.
17. Okwu a bayere Ya we pua gazue na Judia dum, na ala nile di ya gburugburu.
18. Ndi nēso uzọ Jọn we kọrọ ya akukọ bayere ihe ndia nile.
19. Jọn we kpọ madu abua biakute ya nime ndi nēso uzọ-ya, zigara Onye-nwe-ayi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ?