Luk 7:25-36 Bible Nso (IGBOB)

25. Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? nwòke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi ezi uwe kachasi mma, ndi bi kwa n'oké oriri na oké ọṅuṅu, nọ n'ulo ndi-eze.

26. Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ònye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku.

27. Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si,Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi,Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.

28. Asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye ka Jọn uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze Chineke ka ya uku.

29. Mb͕e ndi-Ju nile nuru Ya, ha na ndi-ọna-utu, ha we gua Chineke n'onye ezi omume, ebe ejiri baptism nke Jọn me ha baptism.

30. Ma ndi-Farisi na ndi-iwu juru n'onwe-ha ìzù Chineke, ebe ọ nēmeghi ha baptism.

31. Gini kwa ka M'gēji madu nke ọbọ a tuyere, gini kwa ka ha yiri?

32. Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá.

33. N'ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ.

34. Nwa nke madu abiawo nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu; unu we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, enyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie!

35. Agukwara amam-ihe n'onye ezi omume site n'umu-ya nile.

36. Otù onye n'etiti ndi-Farisi we kpere Ya ka O so ya rie ihe. O we ba n'ulo onye-Farisi ahu, we nọdu na nri.

Luk 7