1. Mb͕e O kwubìri okwu-Ya nile na nti ndi-Ju, O we ba na Kapanaum.
2. Ma aru adighi orù otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise mma, onye di ya oké ọnu-ahia, ọ nọ n'ọnu ọnwu.
3. Mb͕e ọ nuru ihe bayere Jisus, o we zigara Ya ndi-okenye nke ndi-Ju, nārio Ya ka Ọ bia zọputa orù-ya.
4. Ma mb͕e ha biakutere Jisus, ha riọsie Ya ike, si, Ọ bu onye kwesiri ka I mere ya ihe a:
5. n'ihi na ọ nāhu mba-ayi n'anya, ya onwe-ya wukwara ulo-nzukọ-ayi nye ayi.